Steward requests/Global/block-header/ig

This page is a translated version of the page Steward requests/Global/block-header and the translation is 100% complete.
Biko jide n'aka na iso ntuziaka n'okpuru:
Enwere ike ịjụ arịrịọ gị ma ọ bụrụ na ị naghị eso ntuziaka a.
Biko nyochaakwa igbochi ụwa .
Mgbochi ụwa anaghị emetụta Meta-Wiki, yabụ ọ bụrụ na akpọchie adreesị IP ma ọ bụ akaụntụ gị, ị ka nwere ike ịrịọ arịrịọ ebe a. A ga-akọrịrị adreesị IP ma ọ bụ akaụntụ ndị na-akpata ọgba aghara na Meta na Meta: Arịrịọ maka enyemaka sitere na sysop ma ọ bụ bureaucrat kama ịnọ ebe a ka e wee gbochie ha na mpaghara.
Biko kọwa' ụdị ọrụ mkparị cross wiki ị na-ahụ na IP ma ọ bụ akaụntụ. Ịsị IP ma ọ bụ akaụntụ bụ onye mmetọ ogologo oge adịghị enye aka, mana ịsị "IP mebiri na ban.wikipedia, no.wikipedia na vi.wikipedia" bụ. Nke a dị mkpa karịsịa maka ihe mgbochi. Ọ bụrụ na ịnyeghị nkọwa zuru oke, enwere ike ịjụ arịrịọ gị.
Ntuziaka maka ịrịọ arịrịọ

Tupu ịrịọ arịrịọ, gbaa mbọ hụ na:'

  1. Ị maara IP adreesị (ndị) ma ọ bụ akaụntụ ndị ịchọrọ ka a kpọchie ma ọ bụ kpọghe n'ụwa niile.
  2. Maka mgbochi, ngbochi ụwa ụkpụrụ emezuola.
  3. Maka mkpọghe, arịrịọ gị na-ekwupụta ihe mbụ kpatara igbochi IP ma ọ bụ akaụntụ,ma ọ bụrụ na ọ dị.

Iji rịọ ka akpọchie ma ọ bụ kpọghe ya'

Detuo template dị n'okpuru na ala nke ngalaba a ma kọwaa ihe kpatara a ga eji gbochie/kpọghe adreesị ma ọ bụ akaụntụ ndị a.
=== Global block/unblock for [[Special:Contributions/Ụfọdụ IP adreesị ma ọ bụ akaụntụ | Ụfọdụ IP adreesị ma ọ bụ akaụntụ]] ===
{{Status}} <!-- Do not remove this template -->
* {{Luxotool|IP Adreesị/aha njirimara}}
Nkọwa, ihe akaebe, ndịiche, wdg. --~~~~
Mgbe ị na-arịọ ka akpọchie IP gị, rịba ama na ndị nlekọta ụlọ a kwesịrị ịma IP adreesị gị ka ha wee tụlee arịrịọ.
Iji chọta IP gị, biko gaa na https://www.whatismyip.com/

Ọ dịghị mkpa ka ị kpughee IP gị n'ihu ọha - ị nwere ike ịrịọ na nzuzo nye onye nlekọta ọ bụla na IRC ma ọ bụ site na email na: stewards@wikimedia.org.